An Ghaeilge (Asụsụ ndị Irish)

Asụsụ Irish bụ ihe dị mkpa n’ihi na ọ metụtara omenaala ha na akụkọ ihe ndị mere eme. Asụsụ Irish abụghị naanị otu n’ime asụsụ kacha ochie na Europe kamakwa o zuru ụwa niile. Asụsụ Irish so n'òtù asụsụ Celtic, tinyekwara Welsh, Manx, Gàidhlig na Breton. A na-eme atụmatụ na asụsụ a anọwo na Ireland ruo ihe dị ka afọ 2500. E chekwara asụsụ ahụ ndị edere ede n’okwute Ogham site na Narị afọ nke 5 gawazie, yana ihe akaebe na-egosi na-edere asụsụ ahụ na mkpụrụedemede nke ndị Rom n’oge mbido nke Narị afọ 7.

Asụsụ Bekee ghọrọ asụsụ ndị gọọmentị na ndi ọchịchị na Ireland na-eji ekwụrịta okwu n’ihe gbasara ọchịchị n’ihi nchịkwa ndị Britain site na Narị afọ nke 13 gaa n’ihu – Otú ọ dị, asụsụ Irish ka bụ asụsụ nke ndị ọtụtụ mmadụ na-asụ n'etiti 1200 na 1600. Ọ dị nwute na, n’ime Narị afọ nke 16 na nke 17 niile, asụsụ ahụ nwere mmetụta dị ukwuu sitere na ọchịchị mba ọzọ na nnapụ ala n’ike, agha ndị Williamite na mwebata Mmanye Ótụtụ Iwu, bụ́ nke Oke Úkọ Nri na ihe ndị sochirinụ ya mere ka ọ ká njọ.

Asụsụ ndị Irish

Usoro akpachapụrụ anya hazie iji kwalite ma kwado ịsụ asụsụ Irish bidoro na Narị afọ nke 19 gawa n’ihu. Tinyere mmepe ndị ọzọ, e hiwere Òtù Na-ahụ Maka Ichekwa Asụsụ Irish n’afọ 1876, bụ́ nke rụrụ ọrụ iji mee ka a mara asụsụ Irish n’ime usoro agụmakwụkwọ. Conradh na Gaeilge (the Gaelic League) pụtara na 1893, nke bụ ebe igwe mmadụ na-akwado ịsụ asụsụ siri wee mụbaa. E nweela ọtụtụ ihe ndị e meworo n’ịkwado ịsụ asụsụ ahụ kemgbe.

Asụsụ Irish buzi asụsụ izizi akwadoro ugbua ka ana-asụ na Steeti, ọ bụ otu n'ime asụsụ nke ndị Njiko Mba di na Europu nabatara. Dịka etu Ọnụọgụgụ mmadụ n’afọ 2022 siri wee kwuo, nde mmadụ 1.87 na mpaghara 26 na-asụ asụsụ Irish nakwa ihe dịka mmadụ 72,000 na-eji asụsụ ahụ ekwụrịta okwu kwa ụbọchị. Asụsụ Irish na-esiwanye ike na mpaghara 6, ebe ihe karịrị mmadụ 40,000 na-eji asụsụ ahụ ekwụrịtaokwu kwa ụbọchị nakwa ihe fọrọ ntakịrị ka o ruo mmadụ 70,000 na-eji asụsụ ahụ ekwụrịtaokwu ọ dịkarịa mpe kwa izu, dị ka Ọnụọgụgụ mmadụ nke afọ 2021 siri wee kwuo. Asụsụ Irish na-arụ ọrụ dị mkpa na ihe ndị e jiri mara mba anyị ma anyị na-achọ ịkwalite ịhụnanya anyị nwere na asụsụ ahụ n’ime ndị kwagara Ireland.

0 k

lorem ipsum

Donec pede justo, fringilla vitae, eleifend acer sem

0 k

lorem ipsum

Donec pede justo, fringilla vitae, eleifend acer sem

0

lorem ipsum

Donec pede justo, fringilla vitae, eleifend acer sem

0

lorem ipsum

Donec pede justo, fringilla vitae, eleifend acer sem

Klas anyị na ogbako mkparịta ụka

Klas anyị

Ọmụmụ ihe ndị ahụ ga-atọ ụtọ, ma bụrụkwa nke ndị mmadụ na ibe ya ga na-akparịta ụka, na nke ga-eme ka ahụ́ ruo ala, ma bụrụ ohere iso ndị ọzọ nọ n'ógbè ahụ na-akpakọrịta. 

Obi dị anyị ụtọ ịmata na a gaghị akwụ ụgwọ ọ bụla maka nkuzi ndị a, ebe ọ bụ na ngalaba gọọmentị na-ahụ maka Njem nlegharị anya, Omenaala, Nkà, Gaeltacht, Egwuregwu na Mịdịa ji ego akwàdo ya.

Ọgbakọ mkparịtaụka anyị

Anyị na-enyekwa ọgbakọ mkparịtaụka maka otu anyị nke na-achọpụta egwu Irish, ịgba egwu, ahaebe na ọtụtụ ndị ọzọ!

Ainm an Ranga

Cuir síos gasta ar an rang nó an cheadrlann

Ainm an Ranga

Cuir síos gasta ar an rang nó an cheadrlann

Áiseanna

Nasc chuig an áis nó chuig an PDF

Nasc chuig an áis nó chuig an PDF

Nasc chuig an áis nó chuig an PDF

Nasc chuig an áis nó chuig an PDF

Nasc chuig an áis nó chuig an PDF

Nasc chuig an áis nó chuig an PDF

Nasc chuig an áis nó chuig an PDF

Nasc chuig an áis nó chuig an PDF

Igbo